Native Bible

Esther 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya* eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha.

Esther 2:6 in English

Esther 2:6 · Berean Standard Bible

He had been carried into exile from Jerusalem by Nebuchadnezzar king of Babylon among those taken captive with Jeconiah * king of Judah.

Context

4Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe. 5Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin. 6Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya* eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha. 7Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị. 8Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.