Esta 2:8
Esther 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze.
Esther 2:8 in English
Esther 2:8 · Berean Standard Bible
When the king’s command and edict had been proclaimed, many young women gathered at the citadel of Susa under the care of Hegai. Esther was also taken to the palace and placed under the care of Hegai, the custodian of the women.
Context
6Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya* eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha. 7Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị. 8Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze. 9Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi. 10Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.