Native Bible

Ephesians 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.

Ephesians 6:11 in English

Ephesians 6:11 · Berean Standard Bible

Put on the full armor of God, so that you can make your stand against the devil’s schemes.

Context

9Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ. 10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu. 11Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. 12Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. 13Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.