Ndị Efesọs 5:13
Ephesians 5:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.
Ephesians 5:13 in English
Ephesians 5:13 · Berean Standard Bible
But everything exposed by the light becomes visible,* for everything that is illuminated becomes a light itself.
Context
11Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ. 12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo. 13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè. 14Nke a mere na e kwuru,
“Bilie gị onye na-arahụ ụra.
Site nʼọnwụ bilie.
Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.” 15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.