Ndị Efesọs 4:27
Ephesians 4:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enyela ekwensu ohere.
Ephesians 4:27 in English
Ephesians 4:27 · Berean Standard Bible
and do not give the devil a foothold.
Context
25Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ. 26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala.* Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe. 27Enyela ekwensu ohere. 28Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.