Ekiliziastis 9:13
Ecclesiastes 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.
Ecclesiastes 9:13 in English
Ecclesiastes 9:13 · Berean Standard Bible
I have also seen this wisdom under the sun, and it was great to me:
Context
11Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,
ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;
ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,
ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,
ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;
kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị. 12Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru:
Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya,
maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ.
Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ
mgbe ha na-atụghị anya ya. 13Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu. 14Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. 15Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.