Ekiliziastis 9:11
Ecclesiastes 9:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.
Ecclesiastes 9:11 in English
Ecclesiastes 9:11 · Berean Standard Bible
I saw something else under the sun: The race is not to the swift, nor the battle to the strong; neither is the bread to the wise, nor the wealth to the intelligent, nor the favor to the skillful. For time and chance happen to all.
Context
9Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 10Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. 11Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,
ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;
ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,
ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,
ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;
kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị. 12Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru:
Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya,
maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ.
Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ
mgbe ha na-atụghị anya ya. 13Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.