Native Bible

Ecclesiastes 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya.

Ecclesiastes 6:4 in English

Ecclesiastes 6:4 · Berean Standard Bible

For a stillborn child enters in futility and departs in darkness, and his name is shrouded in obscurity.

Context

2Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya. 3Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọ* dị mma karịa ya. 4Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya. 5Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ. 6A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.