Ekiliziastis 3:19
Ecclesiastes 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
Ecclesiastes 3:19 in English
Ecclesiastes 3:19 · Berean Standard Bible
For the fates of both men and beasts are the same: As one dies, so dies the other—they all have the same breath.* Man has no advantage over the animals, since everything is futile.
Context
17A gwara m onwe m,
“Chineke ga-ekpe,
ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe,
nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme,
oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.” 18Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ. 19Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu. 20Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi. 21Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.