Native Bible

Ecclesiastes 12:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tupu anyanwụ na ìhè, ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị, na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.

Ecclesiastes 12:2 in English

Ecclesiastes 12:2 · Berean Standard Bible

before the light of the sun, moon, and stars is darkened, and the clouds return after the rain,

Context

1Ya mere, cheta Onye kere gị mgbe ị ka bụ okorobịa, tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa, na mgbe afọ aka abịarubeghị mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.” 2Tupu anyanwụ na ìhè, ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị, na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri. 3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji, mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata, mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole, mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị, 4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ, mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala, mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ, ma abụ ha niile na-ala ala,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.