Ekiliziastis 12:1
Ecclesiastes 12:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, cheta Onye kere gị mgbe ị ka bụ okorobịa, tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa, na mgbe afọ aka abịarubeghị mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”
Ecclesiastes 12:1 in English
Ecclesiastes 12:1 · Berean Standard Bible
Remember your Creator in the days of your youth, before the days of adversity come and the years approach of which you will say, “I find no pleasure in them,”
Context
1Ya mere, cheta Onye kere gị
mgbe ị ka bụ okorobịa,
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,
na mgbe afọ aka abịarubeghị
mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.” 2Tupu anyanwụ na ìhè,
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri. 3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.