Diuteronomi 9:3
Deuteronomy 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.
Deuteronomy 9:3 in English
Deuteronomy 9:3 · Berean Standard Bible
But understand that today the LORD your God goes across ahead of you as a consuming fire; He will destroy them and subdue them before you. And you will drive them out and annihilate them swiftly, as the LORD has promised you.
Context
1Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe. 2Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?” 3Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa. 4Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha. 5Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.