Native Bible

Deuteronomy 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?”

Deuteronomy 9:2 in English

Deuteronomy 9:2 · Berean Standard Bible

The people are strong and tall, the descendants of the Anakim. You know about them, and you have heard it said, “Who can stand up to the sons of Anak?”

Context

1Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe. 2Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?” 3Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa. 4Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.