Native Bible

Deuteronomy 9:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb.

Deuteronomy 9:5 in English

Deuteronomy 9:5 · Berean Standard Bible

It is not because of your righteousness or uprightness of heart that you are going in to possess their land, but it is because of their wickedness that the LORD your God is driving out these nations before you, to keep the promise He swore to your fathers, to Abraham, Isaac, and Jacob.

Context

3Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa. 4Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha. 5Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb. 6Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike. 7Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.