Native Bible

Deuteronomy 6:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile.

Deuteronomy 6:22 in English

Deuteronomy 6:22 · Berean Standard Bible

Before our eyes the LORD inflicted great and devastating signs and wonders on Egypt, on Pharaoh, and on all his household.

Context

20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?” 21Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt. 22Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile. 23Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa. 24Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.