Diuteronomi 6:21
Deuteronomy 6:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
Deuteronomy 6:21 in English
Deuteronomy 6:21 · Berean Standard Bible
then you are to tell him, “We were slaves of Pharaoh in Egypt, but the LORD brought us out of Egypt with a mighty hand.
Context
19Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru. 20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?” 21Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt. 22Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile. 23Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.