Diuteronomi 6:19
Deuteronomy 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.
Deuteronomy 6:19 in English
Deuteronomy 6:19 · Berean Standard Bible
driving out all your enemies before you, as the LORD has said.
Context
17Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. 18Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa. 19Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru. 20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?” 21Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.