Native Bible

Deuteronomy 6:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa.

Deuteronomy 6:24 in English

Deuteronomy 6:24 · Berean Standard Bible

And the LORD commanded us to observe all these statutes and to fear the LORD our God, that we may always be prosperous and preserved, as we are to this day.

Context

22Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile. 23Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa. 24Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa. 25Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.