Native Bible

Deuteronomy 5:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị, Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha!

Deuteronomy 5:1 in English

Deuteronomy 5:1 · Berean Standard Bible

Then Moses summoned all Israel and said to them:* Hear, O Israel, the statutes and ordinances that I declare in your hearing this day. Learn them and observe them carefully.

Context

1Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị, Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha! 2Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb.* 3Ọ bụghị Onyenwe anyị na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.