Native Bible

Deuteronomy 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

Deuteronomy 4:16 in English

Deuteronomy 4:16 · Berean Standard Bible

that you do not act corruptly and make an idol for yourselves of any form or shape, whether in the likeness of a male or female,

Context

14E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta. 15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya 16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị, 17maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe, 18maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.