Native Bible

Deuteronomy 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe,

Deuteronomy 4:17 in English

Deuteronomy 4:17 · Berean Standard Bible

of any beast that is on the earth or bird that flies in the air,

Context

15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya 16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị, 17maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe, 18maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri. 19Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a Onyenwe anyị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.