Native Bible

Deuteronomy 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta.

Deuteronomy 4:14 in English

Deuteronomy 4:14 · Berean Standard Bible

At that time the LORD commanded me to teach you the statutes and ordinances you are to follow in the land that you are crossing the Jordan to possess.

Context

12Mgbe ahụ Onyenwe anyị sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu. 13O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ. 14E, ọ bụ nʼoge ahụ ka Onyenwe anyị nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta. 15Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya 16ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.