Native Bible

Deuteronomy 34:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe,* nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.

Deuteronomy 34:9 in English

Deuteronomy 34:9 · Berean Standard Bible

Now Joshua son of Nun was filled with the spirit of wisdom because Moses had laid his hands on him. So the Israelites obeyed him and did as the LORD had commanded Moses.

Context

7Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma. 8Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị. 9Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe,* nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis. 10Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis,* onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,* 11onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.