Diuteronomi 34:10
Deuteronomy 34:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis,* onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,*
Deuteronomy 34:10 in English
Deuteronomy 34:10 · Berean Standard Bible
Since that time, no prophet has risen in Israel like Moses, whom the LORD knew face to face—
Context
8Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị. 9Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe,* nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis. 10Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis,* onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,* 11onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile. 12Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.
34:2 Osimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ
34:4 Jen 12:7
34:4 Dit 3:27
34:9 Aịz 11:2
34:10 Dit 18:15,18
34:10 Ọpụ 33:11; Ọnụ 12:8; Dit 5:4
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.