Diuteronomi 34:7
Deuteronomy 34:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.
Deuteronomy 34:7 in English
Deuteronomy 34:7 · Berean Standard Bible
Moses was a hundred and twenty years old when he died, yet his eyes were not weak, and his vitality had not diminished.
Context
5Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru. 6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị. 7Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma. 8Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị. 9Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe,* nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.