Native Bible

Deuteronomy 34:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.

Deuteronomy 34:5 in English

Deuteronomy 34:5 · Berean Standard Bible

So Moses the servant of the LORD died there in the land of Moab, as the LORD had said.

Context

3Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa. 4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’* Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”* 5Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru. 6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị. 7Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.