Diuteronomi 31:18
Deuteronomy 31:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.
Deuteronomy 31:18 in English
Deuteronomy 31:18 · Berean Standard Bible
And on that day I will surely hide My face because of all the evil they have done by turning to other gods.
Context
16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara. 17Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’ 18Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe. 19“Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha. 20Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.