Native Bible

Deuteronomy 31:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara.

Deuteronomy 31:16 in English

Deuteronomy 31:16 · Berean Standard Bible

And the LORD said to Moses, “You will soon rest with your fathers, and these people will rise up and prostitute themselves with the foreign gods of the land they are entering. They will forsake Me and break the covenant I have made with them.

Context

14Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Lee, ụbọchị ọnwụ gị na-abịaru nso. Kpọrọ Joshua ka gị na ya soro bịa nʼụlọ nzute ebe m ga-anọ nye ya ọrụ ọ ga-arụ.” Mosis na Joshua sooro bịa guzo onwe ha nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 16Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara. 17Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’ 18Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.