Native Bible

Deuteronomy 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.

Deuteronomy 3:7 in English

Deuteronomy 3:7 · Berean Standard Bible

But all the livestock and plunder of the cities we carried off for ourselves.

Context

5Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi. 6Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị. 7Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị. 8Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon. 9(Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.)

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.