Diuteronomi 3:5
Deuteronomy 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi.
Deuteronomy 3:5 in English
Deuteronomy 3:5 · Berean Standard Bible
All these cities were fortified with high walls and gates and bars, and there were many more unwalled villages.
Context
3Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ. 4Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan. 5Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi. 6Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị. 7Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.