Native Bible

Deuteronomy 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.

Deuteronomy 3:4 in English

Deuteronomy 3:4 · Berean Standard Bible

At that time we captured all sixty of his cities. There was not a single city we failed to take—the entire region of Argob, the kingdom of Og in Bashan.

Context

2Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.” 3Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ. 4Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan. 5Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi. 6Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.