Diuteronomi 3:2
Deuteronomy 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”
Deuteronomy 3:2 in English
Deuteronomy 3:2 · Berean Standard Bible
But the LORD said to me, “Do not fear him, for I have delivered him into your hand, along with all his people and his land. Do to him as you did to Sihon king of the Amorites, who lived in Heshbon.”
Context
1Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei. 2Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.” 3Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ. 4Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.