Native Bible

Deuteronomy 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.)

Deuteronomy 3:11 in English

Deuteronomy 3:11 · Berean Standard Bible

(For only Og king of Bashan had remained of the remnant of the Rephaim. His bed of iron, nine cubits long and four cubits wide,* is still in Rabbah of the Ammonites.)

Context

9(Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.) 10Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan. 11(Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.) 12Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya. 13Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.