Diuteronomi 29:4
Deuteronomy 29:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
Deuteronomy 29:4 in English
Deuteronomy 29:4 · Berean Standard Bible
Yet to this day the LORD has not given you a mind to understand, eyes to see, or ears to hear.
Context
2Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị,
Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile. 3Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ. 4Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile. 5Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu. 6Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.