Native Bible

Deuteronomy 29:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”

Deuteronomy 29:6 in English

Deuteronomy 29:6 · Berean Standard Bible

You ate no bread and drank no wine or strong drink, so that you might know that I am the LORD your God.

Context

4Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile. 5Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu. 6Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.” 7Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha. 8Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.