Native Bible

Deuteronomy 29:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.

Deuteronomy 29:2 in English

Deuteronomy 29:2 · Berean Standard Bible

Moses summoned all Israel and proclaimed to them, “You have seen with your own eyes everything the LORD did in Egypt to Pharaoh, to all his officials, and to all his land.

Context

1Ndị a bụ okwu nke ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu ka ya na ụmụ Izrel gbaa nʼala Moab na-agbanweghị ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara nʼugwu Horeb. 2Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile. 3Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ. 4Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.