Native Bible

Deuteronomy 28:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ.

Deuteronomy 28:54 in English

Deuteronomy 28:54 · Berean Standard Bible

The most gentle and refined man among you will begrudge his brother, the wife he embraces,* and the rest of his children who have survived,

Context

52Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị. 53Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro. 54Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ. 55Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere. 56Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.