Native Bible

Deuteronomy 28:55 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere.

Deuteronomy 28:55 in English

Deuteronomy 28:55 · Berean Standard Bible

refusing to share with any of them the flesh of his children he will eat because he has nothing left in the siege and distress that your enemy will inflict on you within all your gates.*

Context

53Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro. 54Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ. 55Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere. 56Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị, 57ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.