Diuteronomi 28:36
Deuteronomy 28:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.
Deuteronomy 28:36 in English
Deuteronomy 28:36 · Berean Standard Bible
The LORD will bring you and the king you appoint to a nation neither you nor your fathers have known, and there you will worship other gods—gods of wood and stone.
Context
34Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka. 35Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị. 36Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ. 37Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị. 38Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.