Native Bible

Deuteronomy 28:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.

Deuteronomy 28:35 in English

Deuteronomy 28:35 · Berean Standard Bible

The LORD will afflict you with painful, incurable boils on your knees and thighs, from the soles of your feet to the top of your head.

Context

33Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile. 34Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka. 35Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị. 36Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ. 37Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.