Diuteronomi 27:8
Deuteronomy 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
Deuteronomy 27:8 in English
Deuteronomy 27:8 · Berean Standard Bible
And you shall write distinctly upon these stones all the words of this law.”
Context
6Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị. 7Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị. 8Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.” 9Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu. 10Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.