Diuteronomi 24:6
Deuteronomy 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
Deuteronomy 24:6 in English
Deuteronomy 24:6 · Berean Standard Bible
Do not take a pair of millstones or even an upper millstone as security for a debt, because that would be taking one’s livelihood as security.
Context
4nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa. 5Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ. 6Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya. 7Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị. 8Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.