Diuteronomi 24:4
Deuteronomy 24:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
Deuteronomy 24:4 in English
Deuteronomy 24:4 · Berean Standard Bible
then the husband who divorced her first may not remarry her after she has been defiled, for that is an abomination to the LORD. You must not bring sin upon the land that the LORD your God is giving you as an inheritance.
Context
2Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya, 3ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ, 4nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa. 5Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ. 6Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.