Native Bible

Deuteronomy 24:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị.

Deuteronomy 24:7 in English

Deuteronomy 24:7 · Berean Standard Bible

If a man is caught kidnapping one of his Israelite brothers, whether he treats him as a slave or sells him, the kidnapper must die. So you must purge the evil from among you.*

Context

5Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ. 6Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya. 7Ọ bụrụ na onye ọbụla ezuru nwanna ya onye Izrel nʼohi, mesoo ya mmeso dịka ohu, maọbụ ree ya, onye ohi ahụ ga-anwụ. Nke a bụ ikpochapụ ihe ọjọọ nʼetiti gị. 8Gbalịsie ike ịhụ na ị na-eso iwu niile onye nchụaja, bụ onye Livayị nyere gị banyere ndị nwere ọrịa ekpenta, nʼihi na agwala m ya usoro ha ga-agbaso. 9Chetakwa ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere Miriam, mgbe i si nʼIjipt na-apụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.