Native Bible

Deuteronomy 23:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla!

Deuteronomy 23:22 in English

Deuteronomy 23:22 · Berean Standard Bible

But if you refrain from making a vow, you will not be guilty of sin.

Context

20Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼihe niile i tinyere aka gị ime nʼala ahụ nke ị na-aba inweta. 21Mgbe i kwere Onyenwe anyị bụ Chineke gị nkwa, alala azụ nʼịkwụghachi ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka ị kwụghachi nkwa gị ọsịịsọ. Ọ ga-abụkwara gị mmehie ma i meghị ya. 22Ma ọ gaghị abụrụ gị mmehie ma ọ bụrụ na i kweghị nkwa ọbụla! 23Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị. 24Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.