Native Bible

Deuteronomy 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.

Deuteronomy 23:12 in English

Deuteronomy 23:12 · Berean Standard Bible

You must have a place outside the camp to go and relieve yourself.

Context

10Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 11Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị. 12Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 13Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ. 14Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ejegharị nʼetiti gị ichebe gị, na ịnapụta gị site nʼaka ndị iro gị. Onyenwe anyị achọghị ihu ihe ọbụla na-adịghị mma nʼanya, ka ọ ghara ịlaghachi azụ iso gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.