Diuteronomi 22:23
Deuteronomy 22:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,
Deuteronomy 22:23 in English
Deuteronomy 22:23 · Berean Standard Bible
If there is a virgin pledged in marriage to a man, and another man encounters her in the city and sleeps with her,
Context
21A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu. 22Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel. 23Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo, 24ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu. 25Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.