Native Bible

Deuteronomy 22:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.

Deuteronomy 22:21 in English

Deuteronomy 22:21 · Berean Standard Bible

she shall be brought to the door of her father’s house, and there the men of her city will stone her to death. For she has committed an outrage in Israel by being promiscuous in her father’s house. So you must purge the evil from among you.*

Context

19Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile. 20Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke. 21A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu. 22Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel. 23Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.