Diuteronomi 22:19
Deuteronomy 22:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.
Deuteronomy 22:19 in English
Deuteronomy 22:19 · Berean Standard Bible
They are also to fine him a hundred shekels of silver * and give them to the young woman’s father, because this man has given a virgin of Israel a bad name. And she shall remain his wife; he must not divorce her as long as he lives.
Context
17Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ. 18Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ. 19Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile. 20Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke. 21A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.