Diuteronomi 20:10
Deuteronomy 20:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo.
Deuteronomy 20:10 in English
Deuteronomy 20:10 · Berean Standard Bible
When you approach a city to fight against it, you are to make an offer of peace.
Context
8Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ahụ ga-ekwukwa sị, “Ọ dị onye egwu na-atụ? Ọ bụrụ na o nwere onye ụjọ na-atụ, ya laghachi nʼụlọ ya ka ịtụ ụjọ ya hapụ ijide ndị ọzọ.” 9Mgbe ndịisi agha gwachara ndị agha ha okwu ndị a, ha ga-ahọpụta ndịisi ga-achịkọta usuu ndị agha. 10Mgbe ị bịaruru obodo ọbụla nso ibuso ya agha, ị ga-ebu ụzọ kpọọ ndị bi nʼime ya oku, maka ime udo. 11Ọ bụrụ na ha anabata ime udo, megheere gị ọnụ ụzọ ama ha, ndị niile bi nʼime obodo ahụ ga-abụrụ gị ndị ọrụ na-agbakwara gị odibo. 12Ma ọ bụrụ na ha ekweghị ime udo, lụso gị agha, mgbe ahụ, ndị agha gị ga-agba ya gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.